4 madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n'ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:
5 kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.
6 Kelenu Meri, n'ihi na ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu n'ọtutu ihe nye unu.
7 Kelenu Andrọnaikọs na Junias, ndi-ikwum, ndi adọkọ-kwa-ra mu na ha n'agha, madu ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ozi, ndi bu-kwa-ram uzọ bia nọ nime Kraist.
8 Kelenu Amplietọs, onye m'huru n'anya nime Onye-nwe-ayi.
9 Kelenu Uabenọs, onye ayi na ya nālukọ ọlu nime Kraist, na Stakis onye m'huru n'anya.
10 Kelenu Apelis onye anwaputaworo nime Kraist. Kelenu ndi sitere n'èzí-na-ulo nke Aristọbulọs.