4 Ma-ọbu ì nēlelì àkù nke obi-ọma-Ya na nke nnagide-Ya na nke ogologo-ntachi-obi-Ya, ebe i nāmaghi na ọlu obi-ọma Chineke nēdubà gi na nchèghari?
5 ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;
6 Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:
7 ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:
8 ma ndi di n'akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,
9 nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n'elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa;
10 ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa: