19 O we tugharia uche n'aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n'àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n'okwukwe-ya:
20 o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto,
21 nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa.
22 N'ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume.
23 Ma ọ bughi n'ihi nání ya ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na aguru ya nye ya;
24 kama ọ bu kwa n'ihi ayi, ndi agaje igu ya nye ayi, ndi kwere n'Onye ahu Nke mere ka Jisus Onye-nwe-ayi si na ndi nwuru anwu bilie,
25 Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.