1 Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n'ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu?
2 N'ihi na iwu kekọrọ nwanyi nke nwere di n'aru di-ya mb͕e di-ya nọ na ndu; ma ọ buru na di-ya nwuru, atọpuwo ya n'iwu nke di-ya.
3 Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n'iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche.
4 Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.