17 ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto.
18 N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ.
19 N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike.
20 N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya;
21 n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke.
22 N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.
23 Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.