25 Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike.
26 Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ;
27 ma Onye ahu Nke nēnyocha obi-ayi matara ihe Mọ Nsọ nātukwasi uche na ya, n'ihi na Ọ nāriọrọ ndi nsọ aririọ dika Chineke si chọ.
28 Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.
29 N'ihi na ndi O buru uzọ mara, O bu-kwa-ra uzọ ka ha àkà, ka ha na onyinyo nke Ọkpara-Ya nwekọ otù udi, ka O we buru onye ebu uzọ mu n'etiti ọtutu umu-nna:
30 ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.
31 Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?