9 Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus.
10 Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,
11 ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.
12 M'we chigharia ile olu ahu nke nākpayerem uka. Mb͕e m'chigharisiri m'we hu ihe-idọba-oriọna asa nke eji ọla-edo me;
13 n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu ahu-kwa-ram otù Onye yiri nwa nke madu, Onye nēyi uwe nke ruru n'ukwu ala, ewerewo kwa ihe-ọkiké nke ọla-edo ke n'obi-Ya gburugburu.
14 Isi-Ya na agiri-isi-Ya di kwa ọcha dika aji-anu ọcha, dika snow; anya-Ya abua di kwa ka ire ọku;
15 ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu, dika agāsi na erere ya-ri n'oké ọku; olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri.