Nkpughe 3 IGBOB

1 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.

2 Ghọ onye nēche nche, me kwa ka ihe fọduru guzosie ike, bú nke gaje inwu anwu: n'ihi na ọ dighi ọlu-gi M'huworo nke zuworo ezù n'iru Chinekem.

3 Ya mere, nēcheta otú i nataworo, ya na otú i nuru; nēdebe kwa ya, chèghari kwa. Ya mere, asi na i cheghi nche, M'gābia dika onye-ori, i gaghi-amara kwa oge hour M'gābiakwasi gi ma-ọli.

4 Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n'ihi na ha bu ndi kwesiri.

5 Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M'gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M'gēkwuputa kwa aha-ya n'iru Nnam, na n'iru ndi-mọ-ozi-Ya.

6 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

7 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Filadelfia akwukwọ, si,Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye di Nsọ, Onye-ezi-okwu, Onye nwere nkpisi-ugodi nke Devid, Onye nēmeghe, ọ dighi kwa onye ọ bula gēmechi, Onye nēmechi kwa, ọ dighi kwa onye ọ bula nēmeghe:

8 Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n'iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham.

9 Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.

10 N'ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara ibà n'oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n'elu uwa.

11 Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi.

12 Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēme ka ọ buru ide n'ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n'ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M'gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n'elu-igwe ridata site n'ebe Chinekem nọ, M'gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem.

13 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

14 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si,Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:

15 Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku.

16 Otú a, n'ihi na i di ṅaraṅara, i kpoghi kwa ọku i jughi kwa oyi, M'gāb͕ọpu gi n'ọnum.

17 N'ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m'buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ:

18 aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.

19 Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.

20 Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.

21 Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.

22 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22