2 Anu-ọhia nke m'huru yi-kwa-ra agu, ukwu-ya di kwa ka ukwu bear, ọnu-ya di kwa ka ọnu ọdum: dragon ahu we nye ya ike-ya, na oche-eze-ya, na oké ichi-isi.
3 M'we hu otù n'etiti isi asa ya, dika agāsi na etib͕uru ya-ri ọ nwua; ewe me ka ihe-otiti-ya ahu nke nēweta ọnwu la: o we ju uwa dum anya, ha we so anu-ọhia ahu n'azu;
4 ha we kpọ isi ala nye dragon ahu, n'ihi na o nyere anu-ọhia ahu ichi-isi-ya; ha kpọ-kwa-ra isi ala nye anu-ọhia ahu, si, Ònye yiri anu-ọhia ahu? ònye pu-kwa-ra ibu agha megide ya?
5 ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.
6 O we saghe ọnu-ya ikwulu Chineke, ikwulu aha-Ya, na ulo-ikwū-Ya, bú ndi bi n'elu-igwe.
7 Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.
8 Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.