3 Mọ-ozi nke-abua we wusi ọkwa-ya nime oké osimiri; o we ghọ ọbara dika nke madu nwuru anwu; nkpuru-obi nile ọ bula nke di ndu we nwua, bú ihe di n'oké osimiri.
4 Mọ-ozi nke-atọ we wusi ọkwa-ya nime osimiri nile na isi-iyi nile nke miri nile; miri ahu we ghọ ọbara.
5 M'we nu mọ-ozi miri nile ka ọ nāsi, Onye ezi omume ka I bu, Gi Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye di ọcha n'obi, n'ihi na I kpere ikpé ndia:
6 n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.
7 M'we nu ebe-ichu-àjà ahu ka ọ nāsi, E, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, ikpé-Gi nile bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi.
8 Mọ-ozi nke-anọ we wusi ọkwa-ya n'elu anyanwu; ewe nye ya ike iji ọku chab͕u madu.
9 Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.