3 O we bupum ba n'ọhia nime Mọ Nsọ: m'we hu nwanyi ka ọ nānọkwasi n'anu-ọhia nācha uhie uhie, nke nwere aha di iche iche juputara na nkwulu Chineke, nwe kwa isi asa na mpi iri.
4 Eb͕okwasiwo kwa nwanyi ahu ákwà ododo na ákwà uhie, ewerewo kwa ọla-edo na nkume di oké ọnu na pearl chọ ya nma, o nwe-kwa-ra ìko ọla-edo n'aka-ya nke juputara n'ihe-árú, bú ihe nile nādighi ọcha nke ikwa-iko-ya,
5 edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA.
6 M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku.
7 Mọ-ozi ahu we sim, N'ìhi gini ka o juru gi anya? mu onwem gāgwa gi ihe-omimi nke nwanyi ahu, na nke anu-ọhia ahu nke nēburu ya, nke nwere isi asa ahu na mpi iri ahu.
8 Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.
9 N'ebe a ka uche nke nwere amam-ihe di. Isi asa ahu bu ugwu asa, nke nwanyi ahu nānọdu n'elu ha: