1 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we nu ihe dika oké olu nke oké ìgwè ndi nọ n'elu-igwe, nāsi, Haleluya; Nzọputa nile na otuto nile na ike nile nādiri Chineke-ayi:
2 n'ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n'ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n'isi-ya.
3 Nke mere ya abua ha we si, Haleluya. Anwuru-ọku-ya nārigo elu rue mb͕e nile ebighi-ebi.
4 Orú ndi-okenye na anọ ahu na ihe anọ ahu nke di ndu we da n'ala, kpọ isi ala nye Chineke, bú Onye nānọkwasi n'oche-eze ahu, si, Amen; Haleluya.
5 Otù olu we site n'oche-eze ahu da, si, Nētonu Chineke-ayi, unu ndi-orù-Ya nile, ndi nātu egwu Ya, ndi ntà na ndi uku.
6 M'we nu ihe dika olu nke oké ìgwè ndi, di kwa ka olu ọtutu miri, di kwa ka olu éb͕è-elu-igwe di ike, nāsi, Haleluya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye puru ime ihe nile, nābu eze.