1 M'we hu mọ-ozi ka o nēsi n'elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n'aka-ya, ya na oké nkpọrọ.
2 O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,
3 we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n'elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge.
4 M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.