11 Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru.
12 Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.
13 Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu.
14 Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.
15 N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.
16 Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.
17 Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.