13 Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.
14 Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si,Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:
15 Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku.
16 Otú a, n'ihi na i di ṅaraṅara, i kpoghi kwa ọku i jughi kwa oyi, M'gāb͕ọpu gi n'ọnum.
17 N'ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m'buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ:
18 aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.
19 Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.