3 si, Emejọla uwa, ma-ọbu oké osimiri, ma-ọbu osisi, rue mb͕e ayi gākasiwo ndi-orù Chineke-ayi akàrà n'egedege-iru-ha.
4 M'we nu ọnu-ọgugu ndi akarari, ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, ndi akarari akàrà site n'ebo nile ọ bula nke umu Israel.
5 Akarari akàrà site n'ebo Juda orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Reuben orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Gad orú nnù na nnù iri:
6 Site n'ebo Asha orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Naftali orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Manase orú nnù na nnù iri:
7 Site n'ebo Simeon orù nnù na nnù iri:Site n'ebo Livai orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Isaka orú nnù na nnù iri:
8 Site n'ebo Zebulum orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Josef orú nnù na nnù iri:Site n'ebo Benjamin orú nnù na nnù iri:
9 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;