17 N'ihi na aguru ya-ri n'etiti ayi, o we keta òkè-ya n'ije-ozi a.
18 (Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.
19 Ọ we buru ihe ndi nile bi na Jerusalem mara; ya mere eji akpọ iberibe ala ahu Akeldama n'asusu-ha, nke ahu bu, Iberibe ala ọbara.)
20 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ Abù ọma, si,Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu,Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na,Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.
21 Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n'oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n'èzí n'etiti ayi,
22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya.
23 Ha we guzo madu abua, Josef anākpọ Basabas, onye akpọ-kwa-ra Justọs, na Mataias.