29 Mb͕e ha mezuru ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ bayere Ya, ha si n'osisi ahu wedata Ya, tọb͕ọ Ya n'ílì.
30 Ma Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie:
31 ewe me ka ha hu Ya ọtutu ubọchi, bú ndi soro Ya si na Galili rigoro Jerusalem, ndi buru ndi-Ju ndi-àmà-Ya ub͕u a.
32 Ayi onwe-ayi nēzì kwa unu ozi ọma nke nkwa ahu ekwere nna-ayi-hà,
33 na Chineke emezuwo nka n'ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n'abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta.
34 Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n'ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M'gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa.
35 N'ihi na Ọ nāsi kwa n'abù ọma di iche, I gaghi-enye Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.