37 ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré.
38 Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n'ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu:
39 ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses.
40 Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n'akwukwọ ndi-amuma, si,
41 Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu;N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu,Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.
42 Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n'ubọchi-izu-ike soni.
43 Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke.