15 nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:
16 Onye n'ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n'uzọ nile nke aka ha.
17 Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.
18 Ma n'ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha.
19 Ma ndi-Ju siri n'Antiọk na Aikọniọm bia rue ebe ahu: mb͕e ha rafusiri ìgwè madu nile, ha tua Pọl nkume, dọkpupu ya n'azu abodo, nēchè na ọ nwuru anwu.
20 Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n'echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe.
21 Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk,