23 Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.
24 Ha we gabiga n'etiti Pisidia, bia rue Pamfilia.
25 Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia;
26 ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.
27 Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.
28 Ha na ndi nēso uzọ Jisus we nọgide ọ bughi nwa oge.