1 Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu.
2 Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.
3 Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.
4 Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me.