22 Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:
23 ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:
24 Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n'etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n'iwu;
25 ọ di ayi nma, ebe ayi biaworo nwe otù obi, irọputa ndikom na iwere ha zigara unu, ha na Banabas na Pọl, ndi ayi huru n'anya,
26 ndi raraworo ndu-ha nye n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
27 Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu.
28 N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà: