6 Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a.
7 Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha,Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n'ubọchi mbu Chineke rọputara n'etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n'ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa.
8 Chineke, Onye mara obi madu, we b͕ara ha àmà, ebe O nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi;
9 ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe.
10 Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru?
11 Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n'amara Onye-nwe-ayi Jisus, n'otù aka ahu dika ha onwe-ha.
12 Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha.