8 Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism.
9 Onye-nwe-ayi we site n'ọhù gwa Pọl okwu n'abali, si, Atula egwu, kama nēkwu, ekpuchi-kwa-la ọnu-gi:
10 n'ihi na Mu onwem nọyere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n'ihi na enwerem ọtutu madu n'obodo a.
11 O we nọdu n'ebe ahu otù arọ na ọnwa isi, nēzí okwu Chineke n'etiti ha.
12 Ma mb͕e Galio bu onye-isi nke Akaia, ndi-Ju were otù obi guzo imegide Pọl, we kuta ya n'iru oche-ikpé,
13 si, Onye a nārafu madu ka ha sọpuru Chineke n'uzọ megidere iwu-ayi.
14 Ma mb͕e Pọl gaje isaghe ọnu-ya, Galio siri ndi-Ju, Asi na ọ bu okwu nmejọ ma-ọbu ajọ ihe jọb͕uru onwe-ya, unu ndi-Ju, ọ gēkwesi ka m'nagide unu: