16 Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.
17 Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku.
18 Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme.
19 Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise.
20 Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.
21 Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.
22 Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.