20 Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.
21 Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.
22 Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.
23 Ma ihe di ka oge ahu ọ bughi nkpasu ntà putara bayere Uzọ Jisus.
24 N'ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà;
25 ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a.
26 Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi: