30 Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya.
31 Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe.
32 Ya mere ufọdu nēti nkpu otù ihe, ufọdu nēti kwa ihe ọzọ: n'ihi na nzukọ ahu nāb͕a aghara; ndi kariri n'ọnu-ọgugu n'etiti ha amataghi kwa ihe ha jiri zukọ.
33 Ha we si n'etiti ìgwè madu ahu nupu Aleksanda, ebe ndi-Ju nēnu ya ka o buru uzọ. Aleksanda we kpukpue ha aka, nāchọ ka ọ gọpuru ọra madu onwe-ya.
34 Ma mb͕e ha mazuru na ọ bu onye-Ju, ha nile were otù olu nēti nkpu ihe ra ka oge hour abua, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.
35 Ma mb͕e ode-akwukwọ-ha mesiri ka ìgwè madu ahu jurú, ọ si, Ndikom Efesọs, Ònye di n'etiti madu nke nāmaghi na obodo ndi Efesọs bu odozi-ulo-nsọ, oké Daiana ahu, na nke arusi nke si n'elu-igwe da?
36 Ya mere ebe anāpughi irughari ihe ndia uka, unu aghaghi ijurú, na ighara ime ihe nēchèghi echè.