12 Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini?
13 Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ.
14 Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum.
15 N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu;
16 kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si,
17 Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu:Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:
18 E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyomKa M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.