19 M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu,Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya;Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:
20 Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri,Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara,Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia,Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:
21 O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.
22 Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:
23 Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:
24 Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya.
25 N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile;N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu: