21 O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.
22 Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:
23 Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:
24 Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya.
25 N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile;N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu:
26 N'ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku;Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n'olile-anya:
27 N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis,I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.