1 Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia.
2 Mb͕e ọ gabigasiri n'akuku ahu nile, were kwa ọtutu okwu kasie ha obi, ọ bia na Gris.
3 Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n'ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi.
4 Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia.
5 Ma ndia bururi uzọ je, we nēche ayi na Troas.