1 Ma mb͕e o ruru na ayi dọpusiri onwe-ayi n'ebe ha nọ, nupu kwa ub͕ọ, ayi gara otù iru je Kos, ubọchi so ya ayi we rue Rodes, we si n'ebe ahu je rue Patara:
2 ebe ayi huru ub͕o nke nāgabiga ofè Finisia, ayi we ba nime ya, we nupu.
3 Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya.
4 Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n'ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem.