4 esob͕u-kwa-ram Uzọ a rue ọnwu, nēke ma ndikom ma ndinyom ab͕u nārara kwa ha nye n'ulo-nkpọrọ di iche iche.
5 Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie.
6 O we rue, mb͕e m'nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n'oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n'elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu.
7 M'we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?
8 Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.
9 Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n'ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu.
10 M'we si, Gini ka m'gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n'ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me.