20 Ọ si, Ndi-Ju kwekọrọ ọnu ikpere gi ka i kuda Pọl echi jekuru nnọkọ-ikpé-ha, dika i gaje ijuta ihe bayere ya nke-ọma kari.
21 Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha.
22 Ya mere onye-isi-ọchi-agha zilagara nwa-okorọbia ahu, nēnye ya iwu, si, Agwala onye ọ bula na i gosirim ihe ndia.
23 O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali:
24 ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n'elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi.
25 O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka:
26 Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya.