13 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, Agripa, bú eze, na Banaisi ruru Sisaria, kele kwa Festọs.
14 Mb͕e ha nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, Festọs we debe okwu bayere Pọl n'iru eze ahu, si, Otù nwoke di onye Filiks rapuworo n'ulo-nkpọrọ:
15 mb͕e m'nọ na Jerusalem, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we gwam okwu bayere ya, nāriọ ka ama ya ikpé.
16 M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya.
17 Ya mere mb͕e ha biakọrọ n'otù n'ebe a, alaghm azu, ma ubọchi so ya m'nọduru n'oche-ikpé, si ka ekuta nwoke ahu.
18 Ma mb͕e ndi nēbo ya ebubo guzoro ọtọ, ha ejighi ihe ọ bula nime ihe ọjọ mu onwem chère we bo ya;
19 ma ha ji ajuju ufọdu megide ya bayere nsọpuru-chi nke aka ha, na ajuju bayere otù Jisus, Onye nwururi anwu, Onye Pọl nāsi na Ọ di ndu.