12 N'ime ihe ndia mb͕e m'nāga Damaskọs, ebe m'natara ike na nkweye n'aka ndi-isi-nchu-àjà,
13 n'etiti ehihie, eze, ahurum n'uzọ ìhè sitere n'elu-igwe, kariri onwunwu anyanwu, ka ọ nēnwu mu na ndi sorom n'ije buruburu.
14 Mb͕e ayi nile dasiri n'ala, m'we nu otù olu ka ọ nāsim n'asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu.
15 Mu onwem we si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we si, Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.
16 Ma bilie, guzo kwa n'ukwu-gi: n'ihi na emere ka i hum anya ka M'we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M'gēme ka i hum anya nime ha;
17 nēweputa gi n'aka ndi-Ju, na n'aka ndi mba ọzọ, ndi Mu onwem nēziga gi jekuru ha,
18 isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.