24 Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi.
25 Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma,
26 si,Jekuru ndi nka, si,N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:
27 N'ihi na obi ndi nka mara abuba,Nti-ha kpọchi-kwa-ra,Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
28 Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa.
29 Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n'etiti onwe-ha.
30 O we nọgide arọ abua dum n'ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya,