11 Ma mb͕e o nējide Pita na Jọn aka, ndi-Ju nile b͕akọrọ n'ebe ha nọ n'ìbà nke anākprọ ìbà Solomon, ibobo nwuru ha n'aru nke-uku.
12 Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije?
13 Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.
14 Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu,
15 unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya.
16 Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile.
17 Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra.