13 Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.
14 Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu,
15 unu we b͕ue Onye ahu nke nēdubà madu na ndu; Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; Onye ayi onwe-ayi bu ndi-àmà-Ya.
16 Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile.
17 Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra.
18 Ma ihe nile Chineke buru uzọ kwusa site n'ọnu ndi-amuma-Ya nile, na Kraist-Ya gāhu ahuhu, O mezuru ha otù a.
19 Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a;