7 Mb͕e ha guzosiri ha n'etiti, ha jua ha, si, N'àha ike gini, ma-ọbu n'aha gini, ka unu onwe-unu mere nka?
8 Mb͕e ahu Pita, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ si ha, Ndi-isi ndi-Ju, na ndi-okenye,
9 ọ buru na ekpe ayi onwe-ayi ta ikpé bayere ọlu ọma aluru n'aru onye aru nādighi ya ike, ihe eji zọputa onye a;
10 ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a.
11 Onye ahu bu nkume nke unu, bú ndi nēwu ulo, kpọrọ ihe-efu, nke ghọrọ isi nkuku ulo.
12 Nzọputa adighi kwa n'onye ọ bula ọzọ: n'ihi na aha ọzọ di iche adighi kwa n'okpuru elu-igwe, nke enyeworo n'etiti madu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya.
13 Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.