22 Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile.
23 Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya.
24 Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt:
25 ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi.
26 N'ubọchi soni o we me ka ha hu ya anya mb͕e ha nālu ọ̀gù, o we mebe ka ha dirita n'udo, si, Ndikom, unu bu umu-nne; gini mere unu nēmejọrita onwe-unu?
27 Ma onye nēmejọ ibe-ya nupuru ya, si, Ònye mere gi ka i buru onye-isi na onye-ikpé n'ebe ayi nọ?
28 Ọ̀ bu ib͕um ka gi onwe-gi nāchọ, dika i b͕uru onye Ijipt nyahuru?