40 nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, onye duputara ayi n'ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya.
41 Ha we kpua nwa-ehi n'ubọchi ahu, we butere arusi ahu ihe àjà, we ṅuria n'ọlu aka-ha.
42 Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si,Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaramỌ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel?
43 Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk,Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan,Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha:M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon.
44 Nna-ayi-hà nwere ulo-ikwū nke àmà n'ọhia, dika Ọ kara àkà, bú Onye gwara Moses, ka o me ya ka ọ di ka ihe-atù nke ọ hururi.
45 Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid;
46 onye huru amara n'iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi.