29 nēkwuwa okwu n'aha Onye-nwe-ayi: o we nāgwa ndi-Ju nāsu asusu Grik okwu, ya na ha nājurita kwa onwe-ha ajuju; ma ha tiyere aka-ha ib͕u ya.
30 Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs.
31 Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.
32 O rue, mb͕e Pita nējezu n'ebe nile, ọ ridakuru kwa ndi nsọ ndi bi na Lida.
33 O we hu n'ebe ahu otù nwoke, aha-ya bu Ineas, onye tọb͕ọrọ arọ asatọ n'ute-ya; n'ihi na akuku-aru-ya nwuru anwu.
34 Pita we si ya, Ineas, Jisus Kraist nēme gi ka aru di gi ike: bilie, dozi kwa ute nke gi. Ngwa ngwa o we bilie.
35 Ndi nile bi na Lida na Sheron we hu ya, ndi ahu we chigharikute Onye-nwe-ayi.