5 O we si, Ì bu Onye, Onye-nwe-ayi? Ọ si Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u:
6 ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.
7 Ndikom ndi soro ya n'ije we guzo apughi ikwu okwu, ebe ha nānu olu ahu, ma ha ahughi onye ọ bula.
8 Sọl we si n'ala bilie; ma mb͕e anya-ya saghere, ọ hughi ihe ọ bula; ha we jide ya n'aka duru ya, we dubata ya na Damaskọs.
9 Ọ hughi kwa uzọ ubọchi atọ, ọ dighi kwa ihe ọ nēri ma-ọbu nke ọ nāṅu.
10 Ma otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ na Damaskọs, aha-ya bu Ananaias; Onye-nwe-ayi we si ya n'ọhù, Ananaias. O we si, Le, mu onwem, Onye-nwe-ayi.
11 Onye-nwe-ayi we si ya, Bilie, ga rue amá nke anākpọ Amá Eguzoziri, chọ kwa n'ulo Judas otù onye aha-ya bu Sọl, onye Tasọs: n'ihi na le, ọ nēkpe ekpere;