15 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin;
16 na ndi Avad, na ndi Zema, na ndi Hemat.
17 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram, na Uz, na Hul, na Geta, na Meshek.
18 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.
19 Amuru umu-ndikom abua nye Iba; aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.
20 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;
21 na Hadoram, na Uzal, na Dikla;