1. Ihe Emere 10 IGBOB

1 Ma ndi Filistia busoro Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.

2 Ndi Filistia we sosie ike n'azu Sọl na n'azu umu-ya ndikom; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.

3 Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya; o we nēb͕u ya nb͕u site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.

4 Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa nma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.

5 Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, nwua.

6 Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n'otù.

7 Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.

8 O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.

9 Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu.

10 Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo chi-ha, kpọgide okpokoro-isi-ya n'ulo Degon.

11 Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl,

12 ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n'okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.

13 Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,

14 ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29