1. Ihe Emere 16 IGBOB

1 Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke.

2 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova.

3 Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.

4 O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:

5 ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;

6 Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.

7 Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.

8 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.

9 Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.

10 Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

11 Nāchọnu Jehova na ike-Ya;Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

12 Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

13 Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya,Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

14 Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

15 Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi,Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;

16 Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

17 O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru,Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

18 Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean,Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

19 Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole;E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

20 Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ,Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

21 O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;

22 Si, Unu emetula ndim etere manu aka,Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.

23 Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

24 Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

25 N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.

26 N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:Ma Jehova mere elu-igwe.

27 Ebube na ima-nma di n'iru Ya:Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.

28 Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

29 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.

30 Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.

31 Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.

32 Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;

33 Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova,N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.

34 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

35 Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile,Ikele aha nsọ Gi,Na inya isi n'otuto-Gi.

36 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.

37 O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di:

38 na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:

39 na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon,

40 isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu;

41 ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;

42 ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.

43 Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29