25 Le, anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu: Devid we do ya onye-isi ndi nānu okwu-ya.
26 Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;
27 Shamot onye Haroa, Hilez onye-Pelonait;
28 Ira nwa Ikesh onye Tekoa, Abieza onye Anatot;
29 Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahoa;
30 Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa;
31 Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin, Benaia onye Piraton;