16 Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid.
17 Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.
18 Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.
19 Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl.
20 Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase.
21 Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha.
22 N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.